Ecclesiastes 12

1Ya mere, cheta Onye kere gị
mgbe ị ka bụ okorobịa,
tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,
na mgbe afọ aka abịarubeghị
mgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”
2Tupu anyanwụ na ìhè,
ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,
na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.
3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,
mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,
mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,
mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,
4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,
mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,
mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,
ma abụ ha niile na-ala ala,
5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;
na ihe egwu nke okporoụzọ,
mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifuru
mgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,
agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,
ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.

6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,
tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,
tupu ite adawaa nʼisi iyi,
tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.
7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;
mmụọ b anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.

8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.
“Ihe niile bụ ihe efu!”

Nchịkọta okwu niile

9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro. 10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.

11Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere. 12Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a.

Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.

13Ugbu a anụla ihe ndị a niile,
ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu:
Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile,
nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.
14Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,
ya na ihe nzuzo anyị niile,
ma ha dị mma ma ha dị njọ.
Copyright information for IboBIU